AKỤKỌ ỤWA

NDI IMO, UNU GA-AHỤSI ANYA MA UNU KWE KA ỤZỌDỊMMA MERIKWAA NA NHỌPỤTA 2023 – WIKE

Owere: Gọvanọ Rivas Steeti, Nyesom Wike nọrọ ụbọchị Wenezdee were gwa ndị Imo na ha ga-abụ ndị nzuzu ịhapụ Gọvanọ na-achị Imo Steeti ugbua Sinetọ Hope Ụzọdịmma ka ọ laghachi n’ọchịchị nke ugboro abụọ n’afọ 2023.

Wike kwuru nke a n’Owere, oge ndị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party, PDP mere mmemme iji nabata Sinetọ Sam Anyanwụ, onye a họpụtara na nso a dịka Odeakwụkwọ Ukwu òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ.

Ndị PDP na steeti ahụ jikwa ohere ahụ were nabatakwuo ndị isi ọchịchị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ nke Iyorchia Ayu nọ n’isi ya.

Wike gwara ha hoo!haa! na nke a bụ maka na ha ga-ahụsi anya ma ha kwe ka Ụzọdịmma merikwaa na Nhọpụta afọ 2023.

Wike kwukwara sị, ” Òtù ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress, APC adịghị mma inye ọchịchị na steeti a nakwa na Naịjiriya.

“Iwe na ọnụma juru ụmụ amaala Naịjiriya obi maka na ndị APC bụ ndị Okwe nkwa, eme eme, anyị kwesịrị ijikọta aka ọnụ were chụlaa ha”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close