AKỤKỌ ỤWA
NDỊ NGAGHARỊ IWE #ENDSARS NỌZỊ N’OKPORO ỤZỌ ESI OSIKAPA JELỌF

Bini: Ndi ngagharị iwe #EndSars emechiela ụzọ awara awara si Bini aga Legọs. Ha jiziiri okpuru ógwè njem ụkwụ (pedestrian bridge) dị n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá Mahadum Bini mere ụlọ ékwù ebe ha na-esi osikapa Jelọf.
Ha kwukwara na ọ bụ ótù onye nkwado ha wetara ihe ndị ahụ ha na-esi.
Ka e si na-esi, na-ahọtu meziri ọ dịzịa ka a nọzị oge mmemme.
N’agbanyeghị ndị ótù ha nwụrụ ụbọchị Fraịdee, ndị ngagharị iwe #EndSars ka kwụsịrị ike na – eme ngagharị iwe ebe ahụ.