AKỤKỌ ỤWA
NDI NKWADO PLATEAU UNITED AWAKPOWO NDI ENUGU RANGERS, KỤỌ HA GWOO GWOO



Jọs – Ndi nkwado otu egwu bọọlụ Plateau United nke Jọs nọrọ ụnyaahụ bụ ụbọchị ụka were wakpo ụgbọala ndi otu egwu bọọlụ Rangers International nke Enugwu ka ha gbachara onye lawa, onye lawa n’asọmmpi nke iri na otu n’asọmmpi Nigerian Football League nke afọ 2024/2025.
Ndi nkwado a isi kopuru merụrụ ọtụtụ ndi Rangers ahụ ma tirikwaa ụgbọala ha.
Ka ọ dị ugbua, ndi nlekọta otu egwu bọọlụ Rangers edewo akwụkwọ mkpesa degara otu League Management Committee bụ ngalaba Nigerian Football Association (NFA) na-ahụ maka asọmmpi ahụ.
Nnaa, akụkọ a na-akọ ọ́kọ́ na ntị. Kedu ka ndi mmadụ ga-esi na-akpa àgwà ka anụ ọhịa?