AKỤKỌ ỤWA

NDỊ NTINYỤ ỌKỤ EGBOCHIELA OKE ỌDACHI ỌKỤ ỌGBỤGBA N’OBIAGỤ

Enugwu : Ndi Ụlọ Ọrụ Ntinyụ Ọkụ Enugwu Steeti gbochiri ihe kaara ịbụ oke ọdachi sitere n’ọkụ ọgbụgba dapụtara n’ógbè Obiagụ, Enugwu ụnyahụ site na ịgbata ọsọ enyemaka ebe ahụ n’egbughi oge ọbụla.

Dịka ezigbo ọchịagha, Onyeisi Ụlọ Ọrụ Ntinyụ Ọkụ Enugwu Steeti, Omenka Okwudịrị D. Ọhaa, FNSE ji aka ya duru ndị ọrụ ya wụchie ebe ahụ ozigbo ha nwetara ozi maka ọkụ ọgbụgba ahụ bidoro ebe elekere asatọ nke abalị, were buso ọkụ ọgbụgba ahụ agha.

Ọtụtụ ndị ógbè ahụ kelere Ọhaa na ndị ọrụ ya maka aka ọrụ ha bụ ịgba.

N’okwu ọ gwara onye nta akụkọ, ótù onye bi n’ógbè ahụ, Oriakụ Ndidi Ani kwuru sị, “Ọ bụrụ òtù a ka ndị Ụlọ Ọrụ Ntinyụ Ọkụ Enugwu Steeti si agbata ọsọ ọsọ enyemaka oge ọbụla e nwere ọkụ ọgbụgba, nsogbu agaghị adị.

“Anyị na-ekele Onyeisi Ụlọ Ọrụ Ntinyụ Ọkụ Enugwu Steeti na ndị ọrụ ya maka ịzọpụta anyị na nnukwu ọghọm kara ịdakwasị anyị na njọ ụbọchị a anyị nọ na Naịjiriya taa”

Kaosiladi, dịka o si eme oge ọbụla ọhanaeze kelere ya maka ọmalincha aka ọrụ ndị Ụlọ Ọrụ ya, Omenka Ọhaa kwuru hoo! haa! na onye ekele ga-adịrị bụ Gọvanọ Ugwuanyi

“Onye anyị nile ga-ebunye nnukwu ụkpa ekele bụ Aka na-achị Enugwu Steeti, Rt. Hon. Ifeanyi Ugwuanyi.

“O mere ka ọrụ anyị dịrị anyị mfe site na ime ka akarangwa nile anyị chọrọ ruo anyị aka; ma ụgbọ Ntinyụ ọkụ ọhụrụ udiri ọgbara ọhụrụ dị iche iche nakwa ngwa ntinyụ ọkụ bụ “foam compound” nke anyị enwebughi na mbụ.

“Ọzọkwa Gọvanọ Ugwuanyi bụ Gọvanọ Enugwu Steeti onye ihe banyere Ụlọ Ọrụ Ntinyụ Ọkụ Enugwu Steeti kacha emetụ n’obi. Iji maa atụ, tupu ọchịchị nọ ugbua, Enugwu Steeti nwere sọọsọ ogige ụlọ ọrụ ntinyụ ọkụ abụọ, nke Okporo Ụzọ Ogwuiyi na nke Nsụka. Gọvanọ Ugwuanyi mepezịrị ogige ntinyụ ọkụ ọhụrụ ise; Ahịa Ogbete n’Enugwu, Oji Riva, Obolo Afọ, Enugu Ezike nakwa Ogige Ọzụzụ ndị NYSC n’Ọ̀gwụ̀.

Ọhaa kwukwara na Gọvanọ Ugwuanyi kwalitekwara ọdịmma ndị ọrụ ha site na ibulu ego mmachi akpa maka ọdachi (hazard allowance) site na sọọsọ Naira Iri ruo na Puku Naira Ise.

Ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ bụ nwata akwụkwọ nwanyị mụnyere kandụlụ were labaa ụra.

Ụgbọ ntinyụ ọkụ anọ ka ndị ọrụ ntinyụ ọkụ jiri bịa ọrụ ahụ nke mere ka ọrụ ha dịrị ha mfe.

N’agbanyeghị nkea, ụfọdụ ndị ekperime, ndị chọrọ iji ohere ọkụ ọgbụgba ahụ were zuo ngwo ngwo ndị mmadụ chọburu igbochi ndị ntinyụ ọkụ ahụ ịrụ ọrụ tupu ndị ógbè ahụ agbakọtazịa, jụ na nke ahụ agaghị eme.

Most of the buildings were very old buildings and in most cases the ceiling were made with sticks and woods thus the fire was quick to catch and wreck havoc before the arrival of the fire squad.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close