Uncategorized
NDỊ NTỌ ÁTỌ́RỌ́WO NDỊ NJEM NỌ N’ỤGBỌALA NJEM


Mina: Ndi ntọ nọrọ ụnyahụ, n’ehihie were tọrọ ndị njem iri abụọ so ụgbọala ndị njem nke Niger State Transport Agency (NSTA) eme njem na Yakila dị n’Okpuru Ọchịchị Kontagora, Naịja Steeti.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị ekperime ahụ nọchiri ụzọ malite ịkwa mgbọ aghara aghara.
Ha hapụrụ ótù nwanyị ku obere nwa n’aka kpọrọ ndị ọzọ tinye isi n’ọhịa.
Ụfọdụ ndị ahụ a tọ̀ọ̀rọ̀ si agbamakwụkwọ ha gara na Rajiu na-alọta.
Kaọdịtaa, ndị nche ógbè na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ a chụrụ la ha gawa