NDI NTỌ NA-AKPỌ ND20 DIKA EGO MGBAPỤTA N’ISI ỤKỌCHUKWU KOGI ATỌ SI ỌGBAKỌ EKPERE HA TỌ̀Ọ̀RỌ̀



Lokoja – Ndi òjìégbè atọrọwo ndi ụkọchukwu atọ si ọgbakọ ekpere(crusade) ala n’Ejule dị n’Okpuru Ọchịchị Ofu na Steeti n’elekere iri na otu nke abalị ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ ọnwa Jenụwarị.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndi òjìégbè ahụ chechiri ụgbọala bu ụkọchukwu atọ ahụ n’okporo ụzọ Ejule-Ofakaga-Anyigba, ka ha si ọgbakọ ekpere ahụ were pụta.
Ha na-akpọ Nde Naira iri abụọ dịka ego mgbapụta n’isi ụkọchukwu atọ ahụ.
E mechara nweta ụgbọala ha ebe ndi òjìégbè ahụ hapụrụ ya n’obodo nta Ofakaga nọ n’okporo ụzọ Ejule – Anyigba.
Ótù onye bịara ọgbakọ ekpere ahụ kwuru na ọ bụ Ụkọchukwu Sọnde Oguche bụ onye rapụtara ndi ụkọchukwu ndi ọzọ site na isi ọnwụ ịlawa Anyigba n’ime abalị ahụ, karịa ịrahụ n’Ejule.
Kaosiladị, Williams Aya, Ọnụnaekwuru ndi Uweojii na Steeti Kogi kwuru na ya amaghị maka okwu ahụ mana ọ sị ka ọ jụta.
hmmm, ndi ntọ a, afọ takwara ha mmiri