AKỤKỌ ỤWA

NDI NTỌ̀ NA-ANA EGO MGBAPỤTA N20N(NDE NAIRA IRI ABỤỌ) N’ISI NDI HA TỌ̀Ọ̀RỌ̀ N’ỤZỌ AWARA AWARA BINI-ORE

Bini – Ótù nwaamadị bụ Safiu Kareem ebeela akwa arịrị maka nna ya bụ Akeem Kareem, nakwa ọtụtụ ndi njem ndị ọzọ, ndi ndi ójìégbè tọ̀ọ̀rọ̀ n’ehihie ụbọchi Wenezdee, n’ebe Ụfọdụ dị n’Edo Steeti ka ji ụgbọala eme njem.

Kareem gwara ndi nta akụkọ na ndị ekperime ahụ yi uwe ndi soja nọchiri ụzọ, buru ndi njem, tinye isi n’ọhịa. Ha gbakwara otu onye égbè.

O kwuru na ndị nta ahụ akpọọla ha n’ekwentị were gwa ha na ihe ndị nile ha tọ̀ọ̀rọ̀ ga-atụkọta dika ego mgbapụta bụ N20N(Nde Naịra Iri abụọ)

Kaosiladị, Kareem kwuru na enyi nna ya, onye bu ụgbọala ahụ ha ji si Osogbo na-aga Wọrị gbalahụrụ. Ọ rịọrọ ndị Uweojii na ndi soja ka ha nyeaka gbapụta nna ya, na ya achọghị ka nna ya nwụnahụ ya.

Ndi nta akụkọ na-akọwa na ma Funmilayo Odunlami, ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii n’Ondo Steeti nakwa Chidi Nwabụzọ, ògbò ya nke Edo Steeti enweghị onye zara oge a kpọrọ ha n’ekwentị banyere ọdachi ahụ.

Bikonu, kedu ihe mmadụ ji isi kote na Naịjiriya? Onye na-emetụ njem, ndị nke ya achịrị uche n’aka.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close