Uncategorized
NDỊ NTỌRỊ ATỌRỌLA ỤMỤ AKWỤKWỌ IRI N’OKPORO ỤZỌ ABỤJA-KADUNA


Kaduna: Ndi ntọrị nọrọ ụbọchị ụka tọrọ ụmụ akwụkwọ mmadụ iri si Ngalaba Agụmakwụkwọ Asụsụ Frenchị nke Mahadum Ahmadu Bello (ABU), Zarịya aga Legọs.
Ụmụ akwụkwọ ahụ na-aga ogige mmụta asụsụ Frenchị, Badagrị, Legọs Steeti tupu ndị ntọrị awakpo ha n’ụzọ awara awara si Kaduna gaa Abuja.
Kaọdịtaa, ndị ntọrị ahụ akpọọla ezinụlọ ụmụ akwụkwọ ahụ ịgwa ha na ha ga-akwụ ego mgbapụta Nde Naira Iri atọ.
Ha gbakwara òtù nwata akwụkwọ ahụ chọrọ ịgba ọsọ égbè.