NDI NTOROBỊA AGBAALA ỤGBỌALA BUTERE IHE MBEREDE TARA ISI MMADỤ ATỌ ỌKỤ



Akure – Ndi ntorobịa ejiriwo iwe gbaa ụgbọala butere ihe mberede tara isi mmadụ atọ ọkụ.
Ya bụ ọdachi dapụtara ụbọchị Fraidee a n’okporo ụzọ si Akungba gaa Ikare n’Okpuru Ọchịchị Ọdịda Anyanwụ Ndịda Akoko na Steeti Ondo.
Onye akaebe kwuru na onye ọ̀kwọ́ ụgbọala Toyota Camry akara ndebanye aha ya bụ LND 592 GX meghere ọnụ ụzọ ya na ntụmadị were kụtuo mmadụ atọ nọ n’elu ọgbatumtum na-agafe agafe. Ka ha nọ n’ala, ụgbọala ndi aka nke ọzọ abịa abịa rịzịrị ha elu were gbunyụọ ha anya.
Onye nya ya bụ ụgbọala Toyota Camry riri mbọ mbọ ọsọ ebe ndi ntorobịa jizi iwe gbaa ụgbọala ya ọkụ.
N’okwu ya, Onye Nlekọta ụlọ ọrụ Federal Road Safety Commission na Steeti ahụ, Ezekiel Son’Allah, kwuru na ihe butere ya bụ ihe mberede bụ ịgbafe ụgbọala ọzọ etu ekwesighi ekwesi.
O kwukwara na ndi Uweojii ebugala ozu mmadụ atọ ahụ n’ụlọ ọgwụ Aduloju dị n’Akungba.
Ọ nyere ndi ọ̀kwọ́ ụgbọala ịdọaka-na-ntị banyere idebe iwu okporo ụzọ.
Hmmmm, kedu ihe mmadụ ji isi kote n’ụwa? Lee ka mmadụ si abụrụ ibe ya ajọ chi. Ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndokwa.