NDỊ NTOROBỊA INWE ÁKÁ ỌRỤ NA-ENYE AKA NA MMEPE OBODO
_Dokinta Laz Ude Eze dere edemede a
Ìgbò bụ Ìgbò ekele m unu. E were la m ozi ọzọ bata n’ọgbọ. Ndụ mmiri, ndụ azụ. Ọ ji ngaji eri, cheta kwa ndị ji áká. Kedụ onye bụ onye ntorobịa? Ọ bụ karị ndị gbara afọ ịrị na asatọ ruo afọ ịrị atọ na ìsé.
Ọ bụ ndị ntorobịa kachasị na ọnụ ọgụgụ n’ala Naịjiria na mbà Africa. Ndị erubeghị ịrị afọ anọ kariri mpaghara asaa n’ime iri. Ha nwere íké pụrụ iche e ji arụ ọrụ ma ọ bụ agụ m akwụkwọ. Ike nke a ka ha ga-ejikwa ná edozi obodo ma ọ bụrụ na a zụrụ hà nke ọma. Ọ dị mkpà ka anyị mata na ọzụzụ ndị ntorobịa na ebido n’ime ezinụlọ.
O kwesịrị ka nwa Igbo ọ bụla gụọ akwụkwọ ruo afọ itoolu na opekata mpe. Ụfọdụ ga-agụ gaa n’ihu ebe ndị ọzọ ga amụ ọrụ aka ma ọ bụ azụmahịa. Nwa Igbo ọ bụla ruru afọ iri abụọ na ise kwesịrị ịnwe ezigbo ihe ọ na-eme, ya abụghị na ọ na-arụ ọrụ, o kwesịrị ị na-agụ akwụkwọ nnukwu mahadum. Ma kedụ ihe bụ ihe mgbochi nye ihe ndị a? Kedụ ka anyị ga-eji wepụ ha ma nyere obodo anyị áká? Nke mbụ, ụbịam na ogbenye ọnụ ntụ na-eme ka ụmụaka ghara ịgụ akwụkwọ ruo afọ itoolu. Ụfọdụ na-ebido na nwatakịrị na-ere ahịa n’ụzọ mgbe ụmụaka ibe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ. Nke a mere Gọọmenti Etiti jiri wepụta ịgụ akwụkwọ n’efu ruo afọ itoolu nke ha kpọrọ Universal Basic Education n’asụsụ Bekee. E kwesịrị ime nke a pụta irè n’Alaigbo. Gọọmenti steeti niile n’Alaigbo kwesịrị idozi ụlọakwụkwọ ka ha na-agụ ụmụaka agụụ ije ma bụrụkwa ebe ha ga-enwe ezigbo ndị nkụzi na ezi mmụta.
E kwesịrị ka a na-enye ndị ogbenye ọnụ ntụ ego nnyemaaka ka ha jiri na-achụ agụụ. Nke abụọ, enweghị ebe nkụzi ọrụ aka ná nkà na ụzụ zuru òkè na-ada obi ụmụ ntorobịa mbà n’ebe ịmụ ọrụ aka dị. Ọ ga-amasị m ka ọchịchị gọọmenti ime obodo na nke steeti niile n’Alaigbo kwado nguzobe ebe na ga na-amụ nkà na ụzụ, na ọrụ aka ndị ọzọ dị iche iche. Ọ bụ ihe jọgburu udele na ọ bụ ndị ntorobịa ndị Togo bi n’Alaigbo na-arụ ọrụ aka dị iche iche, ebe ọtụtụ ụmụ ntorobịa Ndigbo enweghị ihe ha na-arụ. Nke atọ, ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na etinye ndị ntorobịa n’ime otu nzuzo. Ha na-eji ha eme nrụrụ áká n’oge ntụli áká. Nke a na-eduhie ọtụtụ ndị ntorobịa. Ụfọdụ n’ime ha na-aghọ zi ndị oji égbè ezu ohi ma ọ bụ ndị ntọ. Ndị ọzọ n’ime ha na nwere ike sere ọgwụ íké na anwụrụ seta isi mgbaka. Biko ka ndị na-eme nke a wepụ aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ.
Nke ikpeazụ m chọrọ itinye kwa ọnụ bụ na ozi ndị ụka okpukpe chi dị iche iche na-eme ka ndị ntorobịa kwenyere na ọ bụghị site na ịgba mbọ ka e ji aba ụba. Ụdị ozizi ahụ na-eduhie ọtụtụ ụmụ ntorobịa. Biko ndị ụka kwesịrị inye aka gbasaa ozi gosipụtara na ọ bụ onye rụọ o rie. Igbo kwuru si na áká ájá ájá na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ. Otú mba ụwa ekwupụta la n’obodo ọ bụla chọrọ mmepe na-akwado ndị ntorobịa ka ha bụrụ ndị ji ike ha na-arụpụta ọrụ ma na-enye kwara obodo aka. Ndị ọ bụla enweghị ọrụ na abụ ngwaọrụ ekwensu. Biko ka otu mmepe obodo niile n’Alaigbo, otu ndọrọndọrọ ọchịchị na gọọmenti dị iche iche gbakọọ nụ aka ọnụ mee ka ọzụzụ na ọrụ bụrụ ihe ga-eru ụmụ ntorobịa niile aka n’Alaigbo. Ka anyị jiri ehihie chụọ ewu ojii. Igbo ndị oma, ọ gwụla ka ọha m n’onu n’izu ụka a. Ya gaziere Igbo niile.