AKỤKỌ ỤWA

NDI ÒJÌÉGBÈ AGBAGBUWO NDI UWE OJII ABỤỌ N’OKPOROỤZỌ UDI-ỌZALA

Enugwu – Ndi òjìégbè nọrọ na mgbede ụnyaahụ, Wenezdee were laa ndụ ndị Uwe Ojii abụọ n’iyi n’Okporoụzọ si Ụdị gaa Ọzala, n’Enugwu Steeti.

Ozi hoo!haa nwetara na-akọwa na ndị Uwe Ojii abụọ ahụ zutere ọnwụ ha oge ndị ójíégbè ahụ búsòrò ụgbọala ndị nche ha nọ n’ime agha mmákpù (ambush) n’ebe elekere asaa n’ọkara nke Uhuruchi, ka ha nọ ọrụ n’Okporoụzọ ahụ.

Ndị ajọ chi ahụ gụnyere ASP Danjuma Joseph nakwa Inspector Abu Elamaje.

Kaosiladị, oge e ji buru ha gbata n’ụlọ ọgwụ UNTH Ituku-Ọzala, ndị dibia bekee kwuru na ha anwụọlarịị.

Onye nke atọ mgbọ gbatara,Inspector Udeme Udomeng, ka ahapụrụ ka ọ laa maka na mmerụ ahụ ya ebughi ibu.

Ka ọ dị ugbua, ndị Uwe Ojii na- ámà imi n’ala n’akụkụ ebe ahụ nile iji nwụchikọọ ndị omekome ahụ.

“Chai! Ọrụ Uwe Ojii siri ike, nwoke gawa ọrụ ezinụlọ ya achịrị obi n’aka. Ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa. Iseeeeeee!”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close