AKỤKỌ ỤWA
NDI ÒJÌÉGBÈ AMAGHỊ AHA HA AWAKPOWO Ọ́DỤ̀ NCHE NDỊ SOJA N’ODUMA/UBURU ; GBUO MA KPỌKWAA HA ỌKỤ


N’onyonyoo wusaworo ebe nile n’ọbaozi mbaụwa (internet), ndị Òjìégbè Amaghị Aha ha nọrọ n’izu ụka gara aga wakpo ọ́dụ̀ nche ndị soja Naịjiriya nọ n’Oduma/Uburu dị n’ókè Enugwu na Ebonyi Steeti.
Ha gburu ndị soja no ebe ahụ ma kpọkwaa ozu ha ọkụ n’ime ụgbọala ha