AKỤKỌ ỤWA

NDỊ ÒJÌÉGBÈ AWAKPOOLA ỤLỌ ỤKA KATỌLIKI NA NSỤKA, TỌRỌ FADA GBALAGA

Nsụka: Ndị òjìégbè nọrọ ụbọchị Satọdee were wakpo ụlọ ụka ndị Katọliki Onye Nsọ Juud Eburummiri n’Ibagwa-Aka dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze were tọrọ ụkọchukwu ha bụ Fada Viktọ Ishiwu ka ụka na-aga n’ihu.

Ndi ntọ ahụ wakporo ụlọ ụka ahụ ka ha na-eme ekpere ofufe nru pụrụ iche a kpọrọ “Adoration Prayer” were malite ịgbali égbè elu aghara aghara.

Oge ụkọchukwu ahụ gbabara n’ime ụlọ ndị Fada, ndị ntọ ahụ chọrọ ya banye ebe ahụ were kpụrụ ya gbalaga.

Ruo ugbua, a mabeghi ebe ndị omekome ahụ kpụgara ya bụ ụkọchukwu.

Hmm, nsogbu nchekwa dị Enugwu na – awụzị akpata oyi.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close