AKỤKỌ ỤWA
NDI ÒJÌÉGBÈ AWAKPOWO ỤLỌ ỌGWỤ KADUNA TỌ̀RỌ́ NDI NỌ̀Ọ̀SỤ̀ NA NDI ỌRỊA
Kaduna – Ndi òjìégbè nọrọ n’izu ụka a were wakpo ogige ahụike dị na Kuyallo nọ n’Okpuru Ọchịchị Birnin -Gwari nke Steeti Kaduna ma tọrọkwa ndi nọọsụ na ndi ọrịa olemole.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndi omekome ahụ kpụrụ ndi nọọsụ abụọ na Imerime ndi ọrịa were narie.
Musa Alhassan, Onyeisi ndi nche ógbè n’obodo ahụ kwuru na njiji ahụ jiri ụbọchị Mọnde n’elekere itoolu nke ụtụtụ. Ọ sịrị na ha buru ụzọ wakpo ụlọ akwụkwọ Government Day Secondary School didebere nso ebe ahụ mana ha enwetaghị onye ọbụla mere ha ji wakpozịa ogige ahụike ahụ.
Oge hoo!haa!! ji nweta ozi a, ma ndi Uweojii ma Gọọmenti Steeti Kaduna enwebeghi ndi kwuru ihe ọbụla.
hmmmm! bikonu kedu udiri arụrụala nke a? Ịbịakwa tọrọ ndi