AKỤKỌ ỤWA
NDI OMEKOME ATỌGBUOLA NWANYỊ ỌSHỤN NWERE Ọ́DỤ̀ NKWỤ



Oshogbo – Ótù nwanyị nwere ọ́dụ̀ nkwụ n’Ikirun, Ọshụn Steeti ka ndị omekome tọgburu n’ime ụlọ ya.
Ya bụ nwanyị a maara dịka Ịya Bisọla ka a hụzịrị ózú ya n’ime ụlọ ya dị na mpaghara Oke Glo, Ikirun

Ka ọ dị taa, o nwebeghi onye mara ihe kpatara e jiri memilaa nwanyị ahụ, onye nke ndi agbata obi ya kwuru na ha anaghị ahụkarị ya maka na ebe o nwere ọ́dụ̀ nkwụ ya tere aka n’ụlọ ya.
E nwetabeghi ozi ọbụla n’aka ndị Uwe ojii banyere ya bụ arụrụ ala tupu ozi a apụọ n’ikuku.
Obi di m uto igu akuko n’ikuku udide a n’igbo. O bu ezi ihe ga-eme ka Amara na o nwere asusu di ka Igbo. Eziokwu, oburu na ndi igbo etinye uchu n’ikwalite asusu Igbo, Igbo ga-abu akwaa akwuru n’uwa nile
Jisienu ike