AKỤKỌ ỤWA

NDI OMEKOME ATỌRỌWO NWANYỊ KUBWA NA ỤMỤ YA ATỌ TINYERE NWATAKỊRỊ ỌNWA ISII

Abuja – Ndị Omekome nọrọ n’abalị ụbọchị Sọnde n’Okporoụzọ Arab dị na Relocation Estate, Kubwa 2, wee tọrọ ótù nwata nwanyị na ụmụaka ya atọ, tinyere nwatakịrị ka dị ọnwa isii.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ndị ekperime ahụ wakporo ogige obibi ahụ n’ebe elekere asatọ n’ọkara nke uhuruchi, malite ịkwa mgbọ aghara aghara. O nweghị ndị uwe ojii ọbụla gbatara ha ọsọ enyemaka oge ahụ.

Ótù onye bi ebe ahụ kwara arịrị na ótù ihe ahụ mekwara ebe ahụ n’ọnwa Disemba afọ gara aga; na ndị ójìégbè malitekwara ịtọ mmadụ aghara aghara ebe ahụ.

Kaosiladị, ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii Ngalaba Abụja, SP Josephine Adeh, oge a kpọrọ ya n’ekwentị kwere nkwa ịchọpụta nke bụ eziokwu.

Hmm, Chineke zọpụta ndị nke ya, obodo aghasaala!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close