AKỤKỌ ỤWA

NDI SOJA AGBAGBUOLA ỤMỤ AKWỤKWỌ SEKỌNDỊRỊ ISE NỌ NGAGHARỊ IWE NA TARABA

Jalingo: Ihe ruru ụmụ akwụkwọ ise si Holy Ghost Secondary School, Pave Chanchji, dị n’Okpuru Ọchịchị Takum na Taraba Steeti ka ndị soja Naịjiriya nọ ebe ahụ gbagburu ka ha na-eme ngagharị iwe.

Ihe butere ngagharị iwe ahụ bụ na ha chọrọ ka ndị Uwe Ojii tọhapụ ótù onye nkuzi ha, Mazị Matiu, onye kpọrọ ótù nwata akwụkwọ ha, Ngufa Kavga gaa “lụwa” n’agwaghị nna ya.

Kaosiladi, ozigbo ndị soja e zitere ọrụ n’obodo ahụ hụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ na-eme ngagharị iwe, ha kpọrọ ndị ótù ha ndị nọ na Kofa Amadụ. Ha nile gbawa ụmụ akwụkwọ ahụ égbè.

Mmiri riri ụfọdụ ka ha na-agbazị ọsọ

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close