NDI SOJA ANWỤCHIKỌWO ODOGWU NDỊ ESN N’AKPỌ̀Ọ̀FỤ̀, ENUGWU STEETI


Enugwu: Ndị soja na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ anwụchikọwo ótù odogwu ndị òtù nchekwa Eastern Security Network (ESN) n’ime ọhịa Akpọ̀ọ̀fụ̀ dị n’Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Nkanụ n’Enugwu Steeti.
Ozi nke Ọnụ na-ekwuru ndị soja Naịjiriya, Brig. Gen. Onyema Nwachukwu wepụtara ụbọchị ụka kọwara na ndị soja si n’ụ̀sụ́ụ́ ndị agha 82 Division, Enugwu bụ ndị gara ọgụ ahụ e jiri jide ya bụ nwaamadị aha ya bụ Godwin Nnamdi ka ndị òtù ya na ndị soja kwarịtachara mgbọ.
https://www.hoohaa.com.ng/mwakpo-nd-ojiegbe-ndi-eze-odinala-imo-steeti-ahapuwo-obi-ha-gbaa-osondu/
Ọchịagha ukwu nke ndị soja Naịjiriya, Lt. Gen. Faruk Yahaya kelere ndị soja na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nile soro gaa ọgụ ahụ.
Ọ gakwara ha ka ha “gaa n’ihu nyopụta ma nwụchikọọ ndị ekperime ndị ọzọ na – akpa aghara na mpaghara ha nọgasị”
E nwetara ótù égbè AK47 nakwa mgbọ ya na mwakpo ahụ.