NDI SOJA EGBUWO NDI ÒJÌÉGBÈ NDI ESN ISE N’UGWUTA, STEETI IMO



Owerri – Ndi soja nke ndi Agha Naịjiriya na ndi Agha Ụgbọ Mmiri Naịjiriya nọrọ ụbọchị Tuuzdee were gbagbuo ndi òjìégbè ndi ESN ise ka ha na ha kwarịtara mgbọ n’ogige ndi IPOB/ESN n’Ejemekuru dị n’Okpuru Ọchịchị Ugwuta na Steeti Imo.
Nkea dị n’ozi nke Ọnụ na-ekwuru ndi Agha Naịjiriya, Maj. Gen. Onyema Nwachukwu wepụtara ụbọchị Wenezdee n’Abụja.
Nwachukwu kwuru na ike ndi soja ahụ ji karịrị nke ndi ójìégbè ESN ahụ, na ha nwetakwara ngwa ọgụ dị iche iche n’ogige ahụ gụnyere otu égbè AK-47, égbè Pump-action Semi-automatic abụọ, otu égbè Ọ́ká,wdg.
O kwuru na ndi soja nwetakwara ọgbatumtum abụọ, ekwentị abụọ nakwa ótù okpu ndi soja.
Nwachukwu kọwakwara na ndi soja nọ ọrụ na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mgbago Úgwú Naịjiriya azọpụtawo mmadụ iri na ise ndi omekome tọ̀ọ̀rọ̀ na Tsohuwar Tasha dị n’Okpuru Ọchịchị Kaura Namoda na Steeti Zamfara.
O kwuru na ndi soja ahụ kere nkwụcha zara ozigbo ha nwetara ozi ntíkù enyemaka, were kwudo ndi ntọ ahụ, ha were kwakọrịta mgbọ.
Site n’okwu ya, ndi omekome ahụ hapụrụ ndi ha ji eji were gbalaga, oge ha hụrụ na “nwoke na ibe ya ha bụ n’okwu ọnụ”, ha gbahachiri azụ n’ogige ha n’ime oke ọhịa.
“Anyị na-arịọ ọhaneze ka ha kee nkwụcha ma zigara ndi ọrụ nchekwa obodo ozi ma ha hụ ihe ọbụla a na-enyo enyo, ka anyị na-aha n’ihu ịgba mbọ ịhụ na udo na ezigbo nchekwa dị n’obodo a”