AKỤKỌ ỤWA
NDỊ SOJA WAKPORO ÓTÙ OBODO N’IDEATỌ ỊBỌRỌ ỌBỌ NDỊ ÒTÙ HA ABỤỌ E GBURU


Owere: Ndi soja Naịjiriya wakporo ótù obodo nọ na mpaghara Ideatọ, Imo Steeti n’isi ụtụtụ taa malite ịkwa mgbọ aghara aghara.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị soja ahụ wuchiri n’ụgbọelu ndị agha dị iri n’isii n’ọnụ ọgụgụ.
Kepu Kepu ruru ndị nta akụkọ anyị ntị bụ na ndị soja ahụ wakporo obodo ahụ iji bọrọ ọbọ maka ndị òtù ha mmadụ abụọ nwụrụ na nso nso a, oge ha na ndị ọrụ nchekwa IPOB a na-akpọ Eastern Security Network (ESN) kwakọrịtara mgbọ