Uncategorized

NDỊ UWE OJII ANWỤCHIKỌWO MMỌNWỤ ZURU N370, 000

Akure: Ndị Uwe ojii nọ n’Ondo Steeti anwụchikọwo mmọnwụ abụọ, Sheriff Ojo and Muhammad Lukman maka izu ego dị Narị Puku Naịra atọ na iri asaa (N370,000).

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe ojii na Steeti ahụ, DSP. Funmilayo Odulami, kwuru na “mmọnwụ ndị ahụ wakporo ndị mmadụ nke gụnyere Adinoyi Mohammed, onye ha ji mma merụchaa ahụ ma zunahụkwa ego dị Narị Puku Naịra atọ na iri ase (N370,000) n’Ipele nọ n’Okpuru Ọchịchị Ọwọ na Steeti ahụ”.

Odulami kwuru sị, “Mmadụ abụọ, ndị jikere dịka mmọnwụ jiri mma merụchaa ótù nwoke, Adinoyi Mohammed ahụ, ma zurukwa ekwentị ya ọnụ ahịa ya bụ N32, 000 na uwe ọnụ ahịa ya bụ N2, 500”

“Mma abụọ, ọtụmọkpọ na ákwà mmọnwụ so na ihe ndị e nwetara n’aka ha”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close