AKỤKỌ ỤWA
NDỊ UWE OJII EJIDELA NDỊ “ADMIN WHATSAPP” ÒTÙ #ENDSARS ABỤỌ


Oshogbo: Ndi Uwe Ojii akpọchiela Babawale Popoola na Fisayo Aderemi mmadụ abụọ bụ ndị nhazi òtù whatsapp e jiri hazie ngagharị iwe#EndSars n’Osun Steeti, kemgbe Tọọzdee.
Ndị Uwe Ojii boro ha ebubo ịma ndị butere ọgbaghara na Steeti ahụ ma gwakwa ha ka ha kpọọ aha ndị òtù ha ndị ọzọ.
N’okwu ya, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Yemisi Opalola kwuru na ime nnyocha ka na-aga n’ihu n’okwu ahụ
“Anyị ga-ama ihe anyị ga-eme, ma e mechaa nnyocha”
Nsogbu dịkwa! Ndị “admin whatsapp”, uche unu dịkwa ya