NDI UWE OJII LỌNDỌN ACHUWO BALOGUN, NWA-AFỌ NAỊJIRIYA N’ỌRỤ MAKA ỊTA ONYE UWE OJII IBE YA ARỤ
Ulọ ọrụ Ndi Uwe Ojii Lọndọn, mba Briteenụ bụ Metropolitan Police Service achụwo nwa-afọ Naịjiriya, Shola Balogun nke ụlọ ọrụ ndi Uwe Ojii Bromley n’ọrụ maka arụ ọ tara onye uwe ojii ibe ya.
Ótù Nnyocha ụlọ ọrụ Ndi Uweojii mba ahụ hiwere nke mere nnyocha ha site n’abalị iri abụọ na otu ruo n’abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọktoba, afọ a, 2024 bụ nke Christopher McKay nọ n’isi ya tinyekwara Amanda Harvey na Kirsty Mead dịka ndi otu ya.
Nchọpụta ha gosiri na Balogun, onye bụ Constable na onye Uweojii nke ọzọ bịara oriri ncheta ọmụmụ onye uweojii ọzọ n’ụlọ egwu awantịlo Goal Sports Bar, n’abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Epreel, afọ 2022.
Kaosiladi, Balogun jiri mmanya ṅụwaa isi nke mere o jiri kpaso onye uweojii ibe ya aghara ma taa ya arụ.
Na mkpebi ha, otu nnyocha ahụ kwuru na ụlọ ọrụ Ndi Uweojii mba ahụ akwadoghi udi ajọ akparamagwa ahụ.
Balogun, nwannaa, ọ kwa ndi egwu ogene sịrị, “Ọ̀ ṅụrụ mmanya ji onwe ya aka”. Gịnị meziri i ji wụọ onwe gị n’ala? Chai! Ihe nkwụ na-eme