AKỤKỌ ỤWA

NDI UWE OJII TIRI MMỌNWỤ IHE: KỌMISHỌNA NDỊ UWE OJII N’ENUGWU STEETI AKATỌỌLA AJỌ ÀGWÀ AHỤ

Enugwu: Kọmishọna ndị Uwe ojii n’Enugwu Steeti, Abụbaka Lawal akatọọla akparamagwa ndi Uwe Ojii wakporo ma tikwaa mmọnwụ gwoo gwoo n’Agbanị dị n’Okpuru Ọchịchị Ọdịda Anyanwụ Nkanụ nke Enugwu Steeti.

N’ozi nke ASP Ndukwe Daniel, Ọnụ na – ekwuru Ndị Uwe Ojii Ngalaba Enugwu Steeti tinyere aka, Kọmishọna ndị Uwe Ojii ahụ kwuru na udiri ihe ahụ ezighi ezi.

O nyekwara ntụziaka ka e mee nyochaa banyere okwu ahụ iji hụ na ndị Uwe Ojii ahụ nwetara ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị.

Lawal rịọrọ ndị nile ọdachi ahụ dakwasịrị ka ha bịa weta mkpesa ha na Ngalaba Nnyocha ndị Uwe Ojii Steeti ahụ n’Enugwu.

O kwuru na ya bụ mwakpo ahụ e gosiri n’onyonyoo nke wusaworo n’ọba ozi mmekọrịta nile dịka nke jọgburu udele, sigbuo nkakwụ ma bụrụkwa nke megidere usoro ọrụ ndị Uwe Ojii

Ọ gwakwara ụmụ amaala Steeti ahụ ka ha wetara ndị Uwe Ojii mkpesa ọbụla ha nwere site n’akara ekwentị ndị a: 08032003702, 08075390883 or 08086671202 ma ọ bụ nke Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii – 08099854883 ma ọ bụ akara email ya: contact042ppro@gmail.com.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close