NDLEA EJIDEWO IFEANYỊ, ONYE ỌRỤ AKA NA COMPUTER VILLAGE, IKEJA NA-ATỤ MGBERE Ọ́GWỤ̀ IKE, NAKWA NDỊ ỌZỌ



Abụja: Mazị Femi Babafemi, Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Ọrụ Nnwụchiko Ọ́gwụ̀ Ike, National Drug Law Enforcement Agency ewepụtawo ozi gosiri ndị mgbere ọ́gwụ̀ ike dị iche iche ụlọ ọrụ ha jidere na nso nso a.
Site n’ozi Babafemi wepụtara ụbọchị Sọnde n’Abụja, NDLEA nwetara ngwugwu ìgbó dị iri na ise na tramadol dị gram Narị iri isii nke e zochiri n’akpa ị̀shá nke Mazi Osahor Ekwueme chọrọ ịtụga Dubai.
O kwurukwara na ndị ụlọ ọrụ ha nwụchikọkwara Mazị Ifeanyi Egbuwaọhịa, onye nke bi n’Igando, Legọs, oge ọ na-achọ isi n’ọ́dụ̀ ụgbọelu MMIA, Legọs were bupu ìgbó dị ebe kilogram ise n’ọkara, e zochiri n’ime ololo mmanụ nri.

“N’agbanyeghị na Ifeanyi na-arụ ọrụ na Computer Village, Ikeja dịka onye ọrụaka, ọ na-arụrụ ndị mgbere ahịa ọ́gwụ̀ ike nọ na Dubai ọrụ na nzuzo.
“Ndị ọrụ anyị nwụchikọkwara mmadụ abụọ; Olatunji Temiola na Osemojoye Sunday n’ọ́dụ̀ ụgbọelu MMIA, Legọs ndị zoro ìgbó dị ótù kilogram n’ọkara n’ime injin ụgbọala arụgharịrị arụgharị, iji tụga ya Dubai.