AKỤKỌ ỤWA

N’ENUGWU EZIKE, NDỊ ÒJÌÉGBÈ AGBAGBUWO ỤMỤ NWANYỊ ABỤỌ SI AHỊA ALỌTA

Nsụka: Ndị òjìégbè nọrọ ụnyaahụ were gbagbuo mmadụ abụọ n’Enugwu Ezike dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Úgwú Igbo-Eze.

Ụmụ nwanyị ndị ajọ chi ahụ a gbagburu gara ahịa Eke-Ozzi were na-alara onwe ha oge ndị ekperime ahụ kpuchiri ihu malitere gbawa égbè aghara aghara.

Ótù nwaanyị gbalahụrụ ya bụ ọdachi kwuru na ya hapụrụ ụgbọala ya gbamie n’ime ọhịa iji zere ndụ, ebe òjìégbè ahụ gbakasịrị ụgbọala ya.

O kwukwara na mmadụ ole na ole ndị ọzọ mekwara ahụ oge ahụ,tinyere ndị mgbọ tụtara

Ụfọdụ na-ekwu na ihe bụ iwe ndị òjìégbè ahụ bụ etu e siri kpojuo ndị soja ebe nile n’Okpuru Ọchịchị ahụ.

Cheta na Gọọmenti Enugwu Steeti nọrọ na nso a were machie keke na ọgbatumtum ịgba n’abalị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Úgwú Igbo-Eze nakwa Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze site n’elekere isii nke uhuruchi ruo n’elekere isii nke ụtụtụ.

Ihe butere nkea bụ ogbugbu ndị òjìégbè gburu ndị Uwe Ojii abụọ, oge ha wakporo ụlọ ọrụ Royal Mass Transit n’Enugwu Ezike. Ha wakpokwara ma gbakwaa égbè aghara aghara na be ndị dị iche iche welitere isi na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị obodo ahụ.

The spokesperson of the Enugu State Police Command, Daniel Ndukwe, could not respond to enquiries at press time.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close