AKỤKỌ ỤWA

NFF KAJI M ỤGWỌ KEMGBE 2005 HA CHỤTURU M DỊKA ONYE NKUZI BỌL SUPER EAGLES – CHRISTIAN CHUKWU

Enugwu – Christian Chukwu, ochiedike egwuregwu bọl akwaala arịrị na òtù n’ahụ maka egwuregwu bọl na Naịjiriya bụ Nigerian Football Federation (NFF) kaji ya ụgwọ ọnwa kemgbe ọ rịturu n’ọkwa dịka onye nkuzi bọl ndi òtù egwu bọl Super Eagles nke Naịjiriya, afọ iri na itoolu gara aga.

Chukwu duru Naijiriya gaa asọmmpi bọl mba Afrịka, Tunisia 2004, ebe ndi Super Eagles nwetara iko ọla ọkụ. A napụrụ ya ọrụ ahụ n’ọnwa Juun, 2005, ka a na-eme asọmmpi ntozu maka iko Mbaụwa Germany 2006.

Ochiedike a, onye bụbu onyeisi òtù egwuregwu Rangers nke Enugwu nakwa Super Eagles nke Naịjiriya kwuru na a ka ji ya ụgwọ site ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ katọrọ ajọ agwa ndi NFF na-akpaso ndi nkuzi bọl bụ ụmụ amaala Naijiriya ma kwukwaa na ahụ ka dị ya mma oge ọ bụ onye nkuzi bọl mba Kenya nakwa Lebanon.

“”Ha na eji ndi nkuzi bọl ndi Naijiria ụgwọ. Ha anaghị eji ndi nkuzi bọl ndi ọcha ụgwọ. Ị ga-akpọta onye nkuzi bọl Naijiriya ịga akwụ obere ego, ị bịakwa na -eji ya ụgwọ”

“Ọ dị mma? A ka ji m ụgwọ ruo taa. Ị gaa n’ụlọ ọrụ ndi NFF, Ị ga-ahụ ụgwọ oge ole ha ji m. E mewo m ihe nile m nwere ike ime mana o nweghị isi. Ọ bụghịkwa sọọsọ m, o nwere ndi nkuzi bọl Naijiriya ndị ọzọ ejikwa ụgwọ, ụfọdụ n’ime ha anwụọla”

N’afọ gara aga, tupu ọ laa mmụọ, Godwin Izilien, onye du òtù egwu bọl ụmụ nwaanyị Naịjiriya bụ Super Falcons were bute iko mba Afrịka, Sawụtụ Afrịka 2004, kwara arịrị na NFF jụrụ ịkwụ ya $12,000 rubere ya maka nturu ugo ahụ.

Hmmmm, “Okeke nwaanyị dịkwa ntị njọ. Ndi NFF, ajọ akparamagwa unu a sigburu udele, ma jọgbuo nkakwụ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close