NKE NA-EME UGBUA

NGAGHARỊ IWE #ENDSARS KA NA-AGA N’IHU MAKA NA ANYỊ ATỤKWASỊGHỊ OBI N’OKWU GỌỌMENTI – ODUALA

Legọs: Ótù onye so achịkọba ngagharị iwe #EndSars, Nwaada Bolatito Oduala (Rinu) ekwuola na n’agbanyeghị na Onyeisi ndị Uwe Ojii (IGP) ekposaala ngalaba ndị Uwe Ojii bụ SARS bụ maka na ndị mmadụ enweghịkwa ntụkwasị obi n’okwu Gọọmenti.

N’agbanyeghị mkposa IGP kposara SARS, ngagharị iwe ka na-aga n’ihu n’obodo dị iche iche na Naịjiriya.

Nwaada Oduala kwuru sị, “O teela ndị Uwe Ojii jibu ekwu ikposa SARS mana” ótù abụghị n’ezi “

“Ndi na-eme ngagharị iwe a chọrọ ka ha malite itinye okwu ha n’ọrụ. Leenu, ka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe, ndị Uwe Ojii agbagbuola mmadụ abụọ, merụọ ọtụtụ ahụ ma kpọchikwaa ọtụtụ mmadụ.

“Nkea egosighị na ha agbanweela. Anyị chọrọ ịhụ ndị arụrụ ala ndị SARS a a tara ahụhụ etu iwu sịrị dị”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close