AKỤKỌ ỤWA

NGAGHARỊ IWE#ENDSARS KA NJỌ KA NA-ABỊA – DOKPESI

Legọs: Ichie Raymond Dokpesi, Onye Nhiwe Ụlọ ọrụ DAAR Communications Ltd ndi nwe ụlọ mgbasa ozi AIT ekwuola hoo!haa!! na ngagharị iwe#EndSars nke ka njọ ka na-abịa.

Dokpesi kwuru nkea ụbọchị Wenezdee oge o duuru ndị DAAR Communications bịara ụlọ akwụkwọ akụkọ The Nation mgbaru n’ụlọ ọrụ ha na Legọs maka ngwo ngwo ha ndị ekperime mebisiri ka a na-eme ngagharị iwe#EndSars.

O kwuru sị, “Mpụ na mkpagbu akarịala n’obodo a. Ndị Naịjiriya, ọ kacha ndị ntorobịa ga-aga n’ihu ịsị ọnwụ maka ezigbo ọchịchị obodo.

Dokpesi dụkwara Gọọmenti Etiti ọdụ ka ọ tọhapụ ndị #EndSars e ji eji ma kpọghekwaa akara ọ́dọ́ ego ụlọ akụ ha a kpọchiri akpọchi, iji mee ka udo chịa.

“#EndSARS bụ mmalite ịgba mbọ maka nnyocha nakwa Nhazigharị Usoro Ọchịchị Naịjiriya. N’ihi ya, ma Gọọmenti elerughi anya na ihe kpatara ya bụ ngagharị iwe ma belata oké ahụhụ ụmụ amaala Naịjiriya na-agabiga, ngagharị iwe #EndSars nke ka njọ ka ga-abịakwa”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close