AKỤKỌ ỤWA
NGAGHARỊ IWE #ENDSARS: LEENU ONYE UWE OJII SONYERE

Nsogbu dị! Ótù onye Uwe Ojii, onye “Mobile Police” sonyere na ngagharị iwe #EndSars ụbọchị Fraịdee n’Ikeja, Legọs.
N’onyonyoo wụsara n’ọbaozi mmekọrịta dị iche iche, ka ndị ọzọ so-eme ngagharị iwe ahụ lewere ya anya, ọ sịrị ha, “Ehee? Gịnị mere na m’agaghị esonye? N’agbanyeghị na m bụ onye Uwe Ojii ibe ha, unu amakwa udiri arụrụ ala ndị SARS rụsara nwanne m nwoke?”


