Uncategorized

NGAGHARỊ IWE GA-ADỊ TAA MAKA IFEANYI , ONYE NA-ERE AKWỤKWỌ AKỤKỌ ONYE UWE OJII GBAJABIAMILA GBAGBURU

Kọọ

Abụja : Njinji jiri ụnyahụ bụ Tọọzdee n’ebe ogige Federal Secretariat, oge ótù onye Uwe Ojii na – eso Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Nta Naịjiriya, Rt. Hon Femi Gbajabiamila gbagburu Mazị Ifeanyi Elekwachi, onye na-ere akwụkwọ akụkọ(newspaper vendor).

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na ka ìgwè ụgbọala Gbajabiamila gbafetere, Okereke na ndị òtù ya ndị ọzọ gbatara ịlele ya etu ha si eme na mbụ.

O nyekwara ha ego tupu ótù onye Uwe Ojii so ya Okereke, onye nwunye ya ka mụrụ nwa ọhụrụ n’izu ụka gara aga egbe n’isi.

N’ihi ya, ndị ótù ya, ndị na-ere akwụkwọ akụkọ na-akwado ime ngagharị iwe n’ụtụtụ taa bụ Fraịdee. Ha kpebikwara na a gaghị ere akwụkwọ akụkọ ọbụla n’Abụja taa, ruo na ha emechaa ngagharị iwe ahụ.

Ọ di mwute na ndị Uwe Ojii Naịjiriya bụzi ndị “A na-agwọ ibi ha a na-eto afọ”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close