AKỤKỌ ỤWA
NGAGHARỊ IWE NDỊ UWE OJII N’UGHELLI DỊ EGWU!


Wọrị: Ndi Uwe Ojii nọ n’Ughelli, Delta Steeti mere ngagharị iwe ụbọchị Tọọzdee maka mwakpo ndị mmadụ na – awakpo ndị Uwe Ojii na ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii.
N’onyonyoo wụsara n’ọbaozi mmekọrịta, ndị Uwe Ojii zọrọ ije na-aga n’okporo ụzọ na-ekwu sị, “Kwụsịnụ igbu ndị Uwe Ojii! O zuwo! Kwụsịnụ ịgba ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii ọkụ!”
Ha kwukwara sị, “Ndi Uwe Ojii bụkwa mmadụ!”
Ha kwuru na ndị ekperime ọbụla ga-abịakwa ịwakpo ha ọzọ ha-ezute ọnwụ ha, na ya bụ ihe akarịala.