AKỤKỌ ỤWA

NGIGE NA NDỊ MỊNỊSTA BUHARI NDỊ ỌZỌ NA – AZỌ ỌKWA ỊJỤ ỊRỊTU N’ỌKWA MỊNỊSTA BỤ ARỤRỤALA – MỌGHALỤ

Ọkammụta Kịnslị Mọghalụ, onye na-achọ ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjiriya n’afọ 2023 n’aha òtù ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Congress, ADC, ekwuwo hoo!haa! na ọ bụ arụrụala na ndị mịnịsta n’ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị ịjụ ịrịtu n’ọkwa dịka iwu Nhọpụta ọhụrụ bụ Electoral Act nke afọ 2021 siri dị.

Dọkịnta Kris Nwabụeze Ngige, onye bụ mịnịsta na-ahụ maka Ọrụ nọrọ na nso nso a were gbaa isi akwara, sị na ya agaghị arịtu n’ọkwa dịka Mịnịsta etu iwu siri kwụ.

Mụọghalụ, onye jibu ọkwa dịka Osote Gọvanọ Ụlọakụ Etiti Naịjiriya ma bụrụkwa onye ji aha òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Young Progressives Party, YPP were zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2019 kwuru nke a n’ozi ya ụbọchị Fraịdee n’ọba ozi mmekọrịta Twitter.

Lee ozi ya na Twitter:

“Ọjụjụ ndi mịnịsta Onyeisiala Muhammadu Buhari ndị na-azọ ọkwa ọchịchị jụrụ ịrịtu n’ọkwa mịnịsta ha jọgburu udele, sigbuo nkakwụ. O gosiri anyaukwu, enweghị ùgwù na akwụwaghị aka ọtọ, nakwa iji ọkwa ọchịchị were eme fọ nfọju àkpà

#Ifekaego

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close