NGỌZỊ EZEỌNỤ EJIRIWO ỌNỤ DỌSAA ỤMỤ AGBỌGHỌ GBA ÁRÁ Ọ̀TỌ́ BỊA AGBAM AJỤJỤ ỌNỤ MMEBE EJIJE



Asaba – Ótù ochie dike Nollywood, Ngọzị Ezeọnụ ejirila ọnụ dọsaa ụmụ agbọghọ abụọ bịara agbam ajụjụ ọnụ maka mmebe ejije (auditioning) n’eyighi uwe ara (bra).
Ezeọnụ, onye so achịkọba ya bụ ịgba ajụjụ ọnụ katọrọ ajọ akparamagwa ụmụ agbọghọ ahụ ndi ka na-abata abata na Nollywood.
“Kedu udiri nzuzu bụ nkea? Kedu ka unu si gbara ara ọtọ, fere ara kpaka kpaka bịa ebea? Kedu ndi unu chọrọ ịrata?”
Ọ dọrọ ha aka na ntị, gwa ha hoo!haa! na ya ga -achụpụ onye ọbụla bịara ịgba ajụjụ ọnụ ya so ahazi n’eyighi uwe ara.
hmmm, Ngọzị Ezeọnụ, were aka. Ọ dịghị mma mmadụ ịdị ka ọnụ a kọrọ ya. O teela e ji ahụta Nollywood dịka ọ̀dọ́ akwamiko, ebe ụmụ nwaanyị ji úkwú ha enweta ọrụ isonye na mmebe ejije. Ndi ochie dike ndi ọzọ kwesịrị iṅomi ya.