AKỤKỌ ỤWA

NKỊTA ATAWO NWATA AKWỤKWỌ N’AKPA ÁMỤ̀

Akure: Ótù nwata akwụkwọ mahadum Adekunle Ajasin dị n’Akungba Akoko n’Ondo Steeti ka nkịta tara n’akpa ámụ̀.

Ya bụ nwata akwụkwọ gara ịhụ mmadụ n’ogige obibi ụmụ akwụkwọ, Vanilla Villa, didebere mahadum ahụ oge nkịta ahụ jiri wakpo ya ma taa ya n’akpa ámụ̀, tupu ndị nọ nso abịa zọpụta ya.

Odeakwụkwọ Mgbasa Ozi Gọọmenti Ụmụ akwụkwọ mahadum ahụ, Oluwafemi Adegbeyeni, kwuru na akpọgara ya bụ nwata akwụkwọ ụlọ ọ́gwụ̀ ozigbo ozigbo.

Ndi Uwe Ojii akparala ya bụ nkịta aka mana ozi hoo!haa!! ekwughizi ma ha akpụrụ nwata akwụkwọ nwe nkịta ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close