AKỤKỌ ỤWA

NKWÀDÓ ZURU OKE: ỌCHỊAGHA T. Y. DANJUMA EBUNYELA PITA OBI ỤGBỌELU YA MAKA ACHỤMNTA NKWÀDÓ

Ọchịagha Tiofilọsụ Y. Danjuma, Laworo ezumike nka ebunyela Mazị Pita Obi, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjiriya n’aha ótù ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party, LP, ụgbọelu mkpori ndụ Challenger 605 Bombardier ya maka iji mee achụmnta nkwàdó ya.

Chetakwa na Alahaji Abụbaka Atiku, onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n’ótù ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party, PDP nakwa Alahaji Bola Ahmed Tinubu, na-azọkwa ọkwa ahụ n’ótù ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress, APC, nwegbadoro ụgbọelu mkpori ndụ nke onwe ha.

N’ezie, nke a bụ nkwàdó zuru oke! A na-ekwu ekwu a na-eme eme. Onye sị na ndị Úgwú anaghị akwado nwannaa Pita Obi?

Hmm, ọ ga-eme ha vam n’anya.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close