AKỤKỌ ỤWA

NNE M GWARA M KA ANYỊ GBUO NWANNEM NWOKE JIRI GWỌỌ Ọ́GWỤ̀ EGO- ONYE YAHOO

Legọs: Ótù nwata nwoke onye yahoo dị afọ iri atọ na abụọ, Afeez Olalere ekwuputala hoo!haa! na ọ bụ nne ya wetara atụmatụ ka o gbuo nwanne ya nwoke nke obere, jiri gwọọ ọ́gwụ̀ ego.

Nwata nwoke ndị Uwe Ojii Ngalaba Legọs Steeti nwụchikọrọ n’Okporo Ụzọ Itamaga, Ikorodu na Legọs Steeti ka o bu akpa jupụtara n’ọbara kwuru nke a oge a kpụpụtara ya ndị omekome ndị ọzọ n’ihu ọhaneze n’isi ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii Ngalaba Legọs Steeti.

“Ọ bụ nne m duru m gaa na nke onye dibịa, onye gwara ya ka m jiri nwanne m nwoke chụọ àjà ma m chọọ inwe ego.

O kwukwara na ọ bụ nne ya wetara nsị ha tinyere nwanne ya na nri, nke o richara were nwụọ ka ọ gachara nke iri abụọ

“E jizi m mma bere akụkụ anụ ahụ ya ndị dibịa si anyị weta dịka mkpịsị aka ya na ntụtụ ya tinyekwara onyonyoo ya.

“Anyị jikwa akwa kechie ozu ya were buga ya n’ọba ozu”

Afeez kọwara na ọ bụ nne ya gwara ya na ọ dị mma ka ha gbuo nwanne ya were mee ọ́gwụ̀ ego, ebe ọ bụ na nwanne ya ahụ ka dị sọọsọ afọ iri abụọ na otu.

Aka ndị Uwe ojii akparakwuola ajọ nne ahụ wetaara atụmatụ iji nwa ya nwoke mee ọ́gwụ̀ ego.

Tụfịakwa!

mma

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close