AKỤKỌ ỤWA

NNWỤCHIKỌ NNAMDI KANỤ: AKA OBIANỌ ADỊGHỊ YA CHAA CHAA

Ọka: Gọvanọ Wili Obianọ nke Anambara Steeti ekwuola hoo!haa! na aka ya adịghị na iweta ego e jiri nwụchikọọ Mazi Nnamdi Kanu, Onyeisi òtù IPOB na Kenya were tọlata ya Naịjiriya.

N’ozi nke sitere n’aka Mazi Jemis Eze, Odeakwụkwọ Mgbasa ozi Gọvanọ Anambara Steeti, kwuru na aka Gọvanọ Obianọ adịghị na ya bụ nkata ahụ a kpara were nwụchikọọ Kanụ, chaa chaa.

Wili Obiano

Ozi ahụ kwuru sị:
“Anyị ahụwo akụkọ nke Saharareporters.com buru were na-ebo Gọvanọ Wili Obianọ nke Anambara Steeti ebubo, na aka ya dị na nkata a kpara iji si Kenya tọlata Mazi Nnamdi Kanu, Onyeisi òtù IPOB, Naịjiriya.

“Anyị ji ohere a eme ka ọhanaeze mata na akụkọ ahụ bụ okpookpo asị. Aka Gọvanọ Anambara adịghị na nkàtà ọbụla megide Mazi Nnamdi Kanu.

” O kwesịrị ido onye ọbụla anya na Gọọmenti Etiti Naịjiriya nke Muhammadu Buhari nọ n’isi ya dịka Onyeisiala na Ọchịagha Izugbe (Commander in Chief) Ndị Agha Naịjiriya, enweghị ihe o ji enyemaka Gọvanọ ọbụla, onye n’enweghị ndị agha ma ọ bụ ngalaba nchekwa obodo nọ n’okpuru ya, iji mee ihe ọbụla masịrị ya.


“N’ihi nke a, ọhanaeze kwesịrị ileghara akụkọ ahụ anya maka na ótù mkpụrụ eziokwu adịghị ya n’ime.”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close