AKỤKỌ ỤWA
“NOODLES” ATAALA ISI ỤMỤ OKOROBỊA NDỊ YAHOO ANỌ N’ABRAKA


Wọrị: Ụmụ okorobịa anọ anwụnyụọla anya n’Abraka, Delta Steeti ka ha richara erimeri “noodles” were laba.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ụmụ okorobịa asaa, ndị yahoo na-atụ akwụkwọ bi n’ótù mkpùrù (room) ebe ha nile riri ya bụ noodles.
Ka chi bọrọ, ndị agbata obi nụrụ ìsì ọjọọ si na mkpùrù ahụ apụta were kpọọ ndị nche ógbè.
Ka ha gbaara ụzọ, ha hụzịrị ozi mmadụ anọ nakwa mmadụ anọ nọzị n’elu ọnwụ, ndị ha bugara ụlọ ọgwụ.