MMEMME

NỌVEMBA 18: ỤBỌCHỊ NCHETA NGAGHARỊ IWE NDỊ INYOM ABA

Abalị iri n’asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ ọbụla bụ ụbọchị ncheta Ngagharị Iwe Ndị Inyom Aba.

Site na Kepukepu ha nụrụ na Gọọmenti Nwa Bekee chọrọ ịmalite atụmatụ ịna ụmụ nwanyị ụtụ isi, ndị Inyom malitere ngagharị iwe n’abalị iri n’asatọ nke ọnwa Nọvemba, n’afọ 1929.

Onye isi ndị haziri ya bụ ngagharị iwe ahụ bụ Nwanyịrịụwa, onye Oloko dị na Mpaghara Aba.

Nke ahụ bụ udiri mbụ ya na Mbaụwa ebe ndị Inyom haziri ngagharị iwe iji megide atụmatụ Gọọmenti ha anabataghị.

Ngaghari iiwe ahụ siri n’Aba banye Kalaba ma wusakwaa n’ọtụtụ obodo nogasị n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjiriya.

Ihe karịrị ndị inyom iri ise tufuru ndụ ha na ngagharị iwe ahụ nke tụrụ ndị ọcha n’anya.

N’oge ugbua, a na-ekwu okwu ngagharị iwe#EndSars, Nwanyeruwa na ndị òtù ya kwesịrị nkwanyere ùgwù

Show More

Related Articles

One Comment

  1. N’agbanyeghị ọnọdụ ụmụnwanyị na afọ 1929, ndi Inyom wee pụta ngagharị n’iji gosi na ha ekweghị na atụmatụ nke gọọmenti nwa bekee banyere ha. N’ezie, ha kwesịrị ka akwanyere ha ugwu.
    Daalụ ri nne ndi nta akụkọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close