AKỤKỌ ỤWA
“NSÍ ONYE ỌRỤ M KỌRỌ M TÓRÓ M ÁFỌ́, Ọ BỤGHỊ ” BEER””- MR. IBU

Jọn Okafọ, odogwu Nollywood a makwara dịka Mr. Ibu ekwuola na ya ji anya hụ ọnwụ anya oge onye ọrụ ya kọrọ ya nsí.
O kwuru sị, “A naghị aṅụ “beer”, ọ bụ nsí ahụ onye ọrụ m ahụ kọrọ m toro m afọ”
N’ajụjụ ọnụ ụlọ mgbasa ozi Nigezie TV gbara ya, Mr Ibu kwuru na ọ naghị aṅụ mmanya ọkụ nke o ji eri oke nri, na ọ bụ nsí onye ọrụ nyere ya oge ọ gara ime ihe nkiri na Nnewi, Anambara Steeti.
“Ka m rutere n’ogige Ihe Nkiri ahụ na Nnewi, ndị e gobiri egobi wakporo m tie m ihe ma kọwaa m nsí”
O kwuru na ndị mmadụ chere na ya anwụọla, na ọ bụ ote egwu ya bulagara ya.
Mr. Ibu kwuru na ndị ọrụ ya akọọla ya nsí ugboro ugboro.