AKỤKỌ ỤWA

NTIWA ỤLỌ NGA BINI:AGHỤGHỌ DỊ YA

Bini: Ọtụtụ ụmụ amaala Naịjiriya anọrọla n’ọba ozi mmekọrịta dị iche iche were kwuo hoo!haa!! na aghụghọ dị na ntiwa ụlọ nga nke mere na Bini, isi obodo Edo Steeti.

Ụfọdụ na-ebo Gọọmenti Steeti ahụ ebubo ihazi ya bụ ntiwa ụlọ nga iji nye ndị na-eme ngagharị iwe #EndSars ajọ aha were wakpo ma chụpụkwa ha n’Okporo ụzọ dịgasị na Steeti ahụ.

Ụfọdụ jụrụ etu ndị nga si si n’ime pụta, gafee ọnụ ụzọ ámá ụlọ nga na-enweghị ndị nche ụlọ nga nọchiri ha ụzọ. Ụfọdụ kwukwara na ọ dị ka ndị nga ahụ dị ka ha akwadoburu akwado na mbụ maka mgbapụ ahụ mere na ha eyighi uwe ndị nga, ọtụtụ n’ime ha kpụkwara afọ ọnụ ha nke ọma ebe òtù n’ime ha kpa ekwentị ya n’aka ma kwụnyekwa akara ngwa ọgbara ọhụrụ “bluetooth earpiece” na ntị ka onye si mkpagharị na Shoprite.

Betty Irabor, onye nwe akwụkwọ akụkọ Genevieve Magazine kwuru na Twitter sị, “Akụkọ ntiwa ụlọ nga nwere ka ọ dị”

Ọrịaku Lauren Idahosa, nwunye Bishọọpụ Feb Idahosa kwukwara sị, “Kedụ ka ndị nga siri gbapụ n’ụlọ nga na-enweghị ọgụ ma ọ bụ ísì ọnwụ ọbụla sitere n’aka ndị nche ụlọ nga”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close