Uncategorized

NWA AFỌ IRI NA ISII EJIRILA AKA ODO KỤGBUO NNA YA KA, OGE YA NA NNE YA NA -ALỤ ỌGỤ

Abụja – Na Karshi, Abụja, ótù obere nwokorọbịa dị afọ iri na isii, Ịmanụwel Jọn ejiriwo aka odo were kụgbuo nna ya bụ Mọnde Jọn, oge ya na nne ya bụ Mercy Jọn na -alụ ọgụ.

Ozi hoo!haa!!nwetara na-egosi na njinji a jiri n’ebe elekere iri nke abalị Tuuzdee izu ụka a.

Ka ọ dị ugbua, ya bụ onye a na-ebo ebubo nọzị n’aka ndị Uwe ojii, ebe a ga-esi kpụpụ ya ụlọikpe ndị na-eto eto maka igbu ọchụ.

N’oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ụbọchị Fraịdee, Kọmishọna ndị Uwe n’Abụja, Harụna Garba kwuru na Ịmanụwel gburu nna ya site na iji aka odo were kụjaa ya isi, oge ya na nne ya na-alụ ọgụ.

Hmmm, nsogbu ụwa. Ugbu a, nwaanyị a ga na-ata nwa ya nwoke ụta maka ime ya nwanyị àjàdụ̀ n’ike. Ndị nne na nna, n’agbanyeghị ihe bụ nsogbu, unu ekwesighi ịnọ n’ihu ụmụ unu na -alụ ọgụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close