AKỤKỌ ỤWA
NWAGBỌGHỌ “POS” ANAPỤLA NDỊ OHI WAKPORO YA ÉGBÈ


Bini: Ann, nwagbọghọ onye nlekọta ígwè nkwụmụgwọ(POS) anapụla ndị ohi abụọ wakporo ya égbè ha ji bịa izu ya ohi n’Uhogua dị n’Okpuru Ọchịchị Ovia, Edo Steeti.
Ndị ohi ji égbè Ọka bịara dịka ndị ahịa, nte ya kaadị ATM, gwa ya na ha chọrọ Narị Puku Naira Abụọ (N200, 000). Nke a mere ka ọ malite inyo ha enyo.
Ha mịpụtara égbè tudo ya. Kaosiladi, maka na o kere nkwụcha, o tichapụrụ onye nke ji égbè égbè n’aka were tiwe mkpu ndị mmadụ were jidezie ha.
Mana e deghị akụkọ POS a n’uju