AKỤKỌ ỤWA
NWANYỊ ESUOLA ỤLỌ DI YA ỌKỤ MAKA ỊLỤ NWANYỊ ỌZỌ


Ótù nwata nwanyị Oriakụ Edina Ng’eno, esuola ụlọ dị ya ọkụ maka ịlụ nwanyị nke abụọ.
Nkea mere na Baraton, Kiminini na Mpaghara Trans Nzoia na mba Kenya ụbọchị Tọọzdee gara aga n’elekere itoolu n’ọkara nke ụtụtụ ka di ya bụ Elaija Nandwa Lomeni gawaworo ọrụ, ụmụ aka ha gawakwuo akwụkwọ.
Nwanyị aahụ na di ya na-enwebu esemokwu banyere mkpebi nwoke ahụ ịlụta nwanyị ọzọ.
Kaọdịtaa, ndị Uwe Ojii na – achọgharị nwanyị ahụ, onye gbafuru ka o sunyere ụlọ di ya ọkụ.