AKỤKỌ ỤWA

NWANYỊ NJABA KWATARA ỌHỤRỤ ATỌRỌWO ỤMỤ ANỌ AGBATAOBI YA GBALAGA

Owere – Ótù nwata nwanyị ụmụ onye agbataobi ya mmadụ anọ gbalaga n’obodo Amakọ, Ụmụákà dị n’Okpuru Ọchịchị Njaba, Imo Steeti ụbọchị Satọdee gara aga.

Ozi hoo!haa!!nwetara na-ekwu na nne ụmụaka ahụ, Oriakụ Chinasa gawara ahịa Afọ Ụmụákà were hapụ ụmụaka anọ ahụ ebe ha n’ụmụaka ndị ọzọ na -egwuri egwu.

Aha ụmụaka ahụ ndị nọ n’agbata afọ anọ na afọ itoolu gụnyere Joy, Charles, Jemine and Pere Ebi. Ọ sịkwa na abụọ bụ ụmụ ya ebe abụọ ndị ọzọ bụ ụmụ nwanne ya nwanyị.

Nwanyị ahụ onye ka kwatara abalị abụọ gara aga n’ụlọ ahụ gwara ụmụaka ahụ ka ha soro ya gaa kpụọ isi n’ọ́dụ̀ ọkpụ isi. Kaosiladi, o sizi ya tọrọ ha funyụọ anya.

Ndị nche ógbè nke obodo ahụ achọgharịchaala ha n’ọhịa n’ụzọ nile mana a hụghị ha.

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii n’Imo Steeti, ASP Henry Okoye, kwuru na ndị ọrụ ha na ámà imi n’ala iji chọpụta ihe mere ụmụaka ahụ.

Hmmm, ndị nne na nna, dọọnụ ụmụ unu aka na ntị, ụwa ajọka

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close