AKỤKỌ ỤWA

NWANYỊ ỌLỤSỊ JI MKPIRISI AKA NA ỤKWỤ BỊA ỤWA DỊZỊ IME ỌMỤMỤ

Sinikiwe Kademaunga, nwanyị Zimbabwe a mụrụ na mkpirisi aka na ụkwụ, onye dị afọ iri abụọ n’isii dịzị ime ọmụmụ ugbua.

Nwanyị ahụ a mụrụ n’enweghị ikpere aka na ikpere mere na aka na ụkwụ ya dịcha mkpirisi bụ onye a maara na Mbaụwa maka mbọ ọ na-agba ihu na ndị nwere ọlụsị nwere ùgwù dịịrị ha.

Zimbabwean motivational speaker born without limbs reveals she is pregnant, shares baby bump photos

Kademaunga, kọwara na o nwere ọtụtụ ihe iche aka mgba oge ọ na-etolite maka ọlụsị ya.

“Oge a mụrụ m, ọ hịara nne na nna m ahụ ikweta na m nwere ọlụsị maka na a na-ahụta nwa ji ọlụsị bịa ụwa dịka abụm ọnụ si n’aka Chineke”

Zimbabwean motivational speaker born without limbs reveals she is pregnant, shares baby bump photos

Kademauga na – eji mkpirisi aka ya ahụ achọ onwe ya mma site na ide onwe ya uri n’ihu ma na-edozikwa ntụtụ isi ya. Ọ na-edozikwa nke ndị ọzọ. O kwuru na kemgbe o kpebiri iji ịhụnanya, nnabata nakwa obi ọma were hụta ọnọdụ ya na ọ na-ebo ị ndụ ya n’udo.

“A chọrọ m ka ndị nile nwere ọlụsị nwee nkwenye n’onwe ha. Unu dị egwu. Unu pụrụ iche ma nweekwa onyinye ọnatarachi n’agbanyeghị ọlụsị unu. Unu mara mma n’udi nke unu. Echiche ọbụla ma ọ bụ nrọ ọbụla ị na-arọ, o nwere onye ị dị mkpa, onye ọ ga-abara uru, gaa n’ihu chawapụ”

O nwere Nzere Mmụta na Ngalaba “Social Work” na Mahadum Cape Town, mba Sawụtụ Afrịka n’afọ 2019, nweekwa ụlọ ọrụ nke ya bụ SK, nke ọrụ ya bụ ikwu okwu mkpalite mmụọ (motivational speaking) na Nkwalite akparamagwa.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close