AKỤKỌ ỤWA

NWANYỊ ANAMBARA AJỤWO ỊṄỤ MMIRI E JI SAA OZU DI YA

hoo!haa! na – echeta ADM NDỤBỤISI KANỤ, Dike ọchịchị ziri ezi

Ọka: Oriaku Chiọma Asọmụgha, nwanyị àjàdụ̀ dị iri afọ atọ n’anọ, ebekuola ọhaneze ka a gbatara ya ọsọ enyemaka maka mmanye ụmụnne di ya laworo mmụọ na-achọ ịmanye ya ka ọ ṅụọ mmiri e ji saa ozu di ya, iji gosi na ọ bụghị ya gburu ya.

Chiọma kwuru na ya na di ya, Chalsị, onye Ubahuekem, n’Okpuru Ọchịchị Ihiala, Anambara Steeti biri biri n’udo n’Ajangbadi, Ojo, Legọs Steeti ma mụtakwa ụmụ anọ.

“E tinyere elimozu di m ụbọchị Monde, abalị iri n’anọ nke ọnwa a bụ Juun. Kaosiladi, kemgbe anyị lọtara maka elimozu, ụmụnne di m chụpụrụ m n’ụlọ maka na m jụrụ ịṅụ mmiri e ji saa ozu di m”

O kwuru na o kpesaworo ndị be ha n’Ọraifite nakwa ndị Ụlọ ọrụ National Human Rights Commission (NHRC) maka okwu ahụ.

Oriaku Laura Ugwuanyi, Onye Nlekota NHRC n’Anambara kọwara na ụmụnne di nwanyị ahụ kpọrọ ekwo nkụ banyere idozi okwu ahụ.

Oge ndị nta akụkọ kpọtụrụ ya, Mazi C Don Adinuba, Kọmishọna na – ahụ maka Mgbasa ozi na steeti ahụ kwere nkwa itinye ọnụ n’okwu ahụ.

Tụfịakwa! Ndigbo, Okeke nwanyị dịkwa ntị njọ

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close