AKỤKỌ ỤWA

NWANYỊ KWỌJIPỤRỤ AKA YA IJI NWETA EGO NSHỌ́Ọ́RANSỊ̀ EJEELA NGA

Nwa-ada Julija Adlesic, onye Ljubljana dị na mba Slovenia ka a tụrụ nga afọ atọ maka ịkpachara anya kwọjipu aka ya iji nweta ego dị £925,000 dịka ụgwọ nshọ́ọ́ransị̀.

Ọ bụ ya na enyi ya nwoke kpara nkata ọjọọ ahụ were rute n’ụlọ ọgwụ ka ha ma na oge agafeela itighachinwu aka ahụ azụ n’ahụ ya.

Adlesic gwara ndị ụlọ ọgwụ na ya kwọbiri aka oge ọ na-akwọbi álákà osisi n’ọhịa.

Kaosiladi, kpọrọ kpọtọ gazịrị n’ihu ehi oge ndị ụlọ ọrụ nshọ́ọ́ransị̀ ahụ malitere ime nnyocha tupu ha akwụọ ya bụ ụgwọ.

Hmm, onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ elie ya. Ugbua, agbọghọ nzuzu a eburula mkpirisi aka jee nga n’enwetaghị oge o jiri maka ya mee onwe ya ọlụsị.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close