AKỤKỌ ỤWA
NWANYỊ NỌ EBUMỌNỤ IZU ỤKA ABỤỌ EKOROPUWO, NWỤỌ


Legos: Njinji jiri n’ụlọ ụka Apostolic Church, Ori-Oke Gbogunmi, Isheri Olofin, Legọs Steeti ụbọchị Tuuzdee, oge ótù nwanyị, Joy Owoyele, koropuru ma nwụnyụọ anya ka ọ na-eme ebumọnụ izu ụka abụọ.
Ozi hoo!haa! nwetara gosiri na ya bụ nwanyị ahụ nọ n’ụbọchị iri nke ime ekpere na ebumọnụ izu ụka abụọ nke e nyere ya n’ebe ahụ.
Kaosiladị, o koropuru ka ha nọ n’ekpere ụtụtụ nke abalị iri. E bugara ya n’ụlọ ọgwụ Igando General Hospital ebe ọ nọrọ nwụọ.
Ụkọchukwu Alfredi Sọnde, ụkọchukwu na – elekọta ụlọ ụka ahụ kwuru na o nweghị ka ha siri mejọọ, na nwanyị ahụ laworo mmụọ bịara ime ekpere ka ibe ya, tupu o koropu.